'Anọ m n'ihu ụlọ m, mgbe ndị agha gbara m egbe n'Enugwu'

Mgbe e biputara ya

Nwoke ndị agha gbara egbe mgbe ndị nchekwa na-achụsasi ndi chọro iwakpo ụloakwụkwọ Queens dịka ha sị na nri enyemaka Covid-19 no ebe ahụ.

Nwoke sị na ọ nọ n'ihu ụlọ ya mgbe otu onye agha na-achụ ndị mmadụ ọsọ pụtara gbaa ya egbe.

Ọ sị na mgbọ egbe a si n'otu apata ya gafee na nke ọzọ ma metụtakwa amụ ya.

Gọọmentị Enugwu Steetị site n'ọnụ kọmishọna mgbasaozi bụ James Aro sị na ha amaghị ma o nwere onye e merụrụ ahụ.

Na ọ bụ mgbe ndị nchekwa mechara nyocha ha na-eme tupu ha a mata nke bụ eziokwu.

Aro kwusiri ike na o nweghi ngwa nri 'palliative' ọbụla dị n'ụlọakwụkwọ Queens na gọọmentị ekesachaala ya.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọnụ ndị ọrụ nchekwa banyere nke amịtaghị mkpụrụ dịka ha azaghị oku.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: