Etu ngagharịiwe megide SARS si aga n'Awka dị n'Anambra Steetị
Mgbe e biputara ya
Ndị ntoroọbịa bi n'Awka dị n'Anambra Steetị amalitela ime ngagharịiwe megide mkpagbu ha na-ahụta n'aka ngalaba uweojii a kpọrọ SARS.
Ha malitere nke a n'ebe a kpọrọ 'Alex Ekwueme Square dị n'Awka ma buruzie ya gawa 'Aroma' dịka ha na-abụ abụ.
Ha gakwara n'ahịa Eke Awka tupu ha e ruo n'isi ụlọọrụ ndị uweojii bụ ebe kọmishọna uweojii n'Anambra gwara ha okwu.
Ọ sị ha na ndịisi uweojii na Naịjirịa ga-ebe okwu anya ma nwogharịa ngalaba SARS kpam kpam.