Onitsha Port: Uru mmepe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha ga-abara gị

Mgbe e biputara ya

George Moghalu bụ onyeisi ụlọọrụ njem ụgbọmmiri a kpọrọ 'National Inland Waterways Authority' akọwaala ụfọdụ uru mmepe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha ga-abara ndị Igbo n'azụmaahịa.

N'agbanyeghị na o kwuru na ọ bụ n'afọ 2021 ka ọdọụgbọmmiri nke Ọnịcha a ga-ebido rụwa ọrụ, Moghalu kwuru na ha chọrọ ka o bido ọrụ tupu oge ha kwere na nkwa eruo.

George Moghalu kwuru na ha esila ọdọ mmiri Onne dị na Rivas steeti buru ibu bata Onitsha ma bụrụ kwa kọntena laghachị Onne iji tulee ya bụ ọdọ ụgbọ mmiri Onitsha; ma ihe niile gara nke ọma.