'Ana m aga ụka n'Emene tupu m jekwuru ọgbaghara mere ndị agha jiri gbajie m ụkwụ'

Mgbe e biputara ya

Abraham Ani sị na ndị uweojii kedoro ya n'akwa dị n'ụlọgwụ Orthopaedic dị n'Enugwu n'ihi na ha na-ebo ya na ọ bụ onye Ipob.

"Onye ọrụ nchekwa gbara m egbe n'ụkwụ n'ụbọchị 23 Ọgọst ndị IPOB na ndị uweojii nwere nsogbu n'Emene."

Otu nwoke nọ n'ụlọ ọgwụ Orthopedic Enugwu aha ya bụ Abraham Ani etiela mkpu sị ndị uwe ojii wepụ ya ịga ha kedoro ya n'ụkwụ n'ihi na ya abụghị onye IPOB.

Abraham gwara BBC na nsogbu ya malitere ụbọchị ụka 23 August oge ndị IPOB na ndị uwe ojii nwere nsogbu.