Frank Ibezim: E duola ya n'iyi ọrụ dịka onye nnọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu ukwu

Aha onyonyo, Ọgbaghara na nkewa adịghị na APC Imo state - Enyinna Onuegbu
Mgbe e biputara ya

Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmad Lawan eduola Chukwuma Frank Ibezim n'iyi ọrụ dịka onye omeiwu na-anọchite anya Imo Nọt n'ụlọomeiwu ukwu.

Ibrahim El-Ladan bụ oje ozi nke ụlọomeiwu ukwu ka Lawan nyere iwu ka o duo ya n'iyi ọrụ.

Ka ọ na-edu Ibezim n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tuzde, 27 nke ọnwa Epreelụ 2021, Lawan kwuru sị "Site n'ịṅụ iyi ọrụ a, anọchitela Imo Nọt anya ọfụma."

Cheta na Ibezim na Ifeanyi Araraume bu okwu gbasara onye meriri na ya bụ ntuliaka gaa ụlọikpe mgbe e mechara ntuliaka n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2020, maka oche ahụ.

Ndị 'Ben Johnson' agaghị eso zọọ ọkwa Senator Imo North - FCC Jones Onwuasoanya

Onwuasoanya FCC Jones onye na-ekwu na ọ bụ ya bụ onye mgbasa ozi APC n'Imo steeti, ka na-ekwusi ike na ọ bụ Ararume meriri ya bụ ntuliaka.

O kwuru na ọ bụ n'Owere ka ụfọdụ ndị nọrọ gbaa izu ma kpọpụta aha Frank Ibezim dịka onye meriri ntuliaka ahụ.

APC

Ebe foto si, FCC Jones

Nkọwa foto, Mpụtara nke a na-egosi na ọ bụ Ifeanyi Ararume meriri, mana ndị isi APC n'Imo steeti sị na ọbụghị eziokwu

Onwuasoanya dọkwara aka na ntị ka ndị isi APC nọ n'Abuja nakwa Inec kpachapụ anya ma ghara iwepụta Frank Ibezim ka ọ nọchite anya ndị APC na ntụliaka ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na dịka Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na ya si ụzọ 'Ben Johnson' bata n'ọchịchị, na ha agaghị ekwe ka o mee otu a ọzọ.

Okwu nke a na-abịa dịka ndị isi otu APC n'Abuja nakwa Inec kpọpụtara aha Frank Ibezim dịka onye meriri.

FCC Jones
Nkọwa foto, Onwuasoanya FCC Jones kwuru na ọ bụ ya bụ ọnụ na-ekwuru APC n'Imo steeti

Enyinna Onuegbu, onye sokwa na ndị isi APC n'Imo steeti, gwaburu BBC Igbo n'ekwentị na FCC Jones bụ onye ọchọnganoko.

O kwuru sị: "Onye meriri ntuliaka ime ụlọ anyị mere n'Imo North bụ Frank Ibezim."

"Ọ bụ ya ka ndị isi pati anyị nọ n'Abuja ma."

Onuegbu kwukwara na akwụkwọ ahụ na-egosi aha Ararume dịka onye meriri ya bụ ntuliaka bụ okpotokpo asị.

Benjamin Uwajumogu

Ebe foto si, BuWAJUMOGU/tWITTER

Nkọwa foto, Benjamin Uwajumogu bụ onye nọchiburu anya ndị imo North n'ụlọ omeiwu Sineti, mana ọ laala mmụọ.

Oche ndị Imo North n'ụlọ omeiwu ukwu ghe oghe ugbua n'ihi na Benjamin Uwajumogu onye nọbụ na ya alaala mmụọ.

Ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' kwuru na ọ bụ na abalị ikpeazụ nke ọnwa Ọụtoba ka ha ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ọhụrụ.

Pati ndị ọzọ a ma ama emekwaala nhọpụta nke imeụlọ ma wepụta ndị ga-anọchị anya ha na ya bụ ntuliaka.

Dịka akụkọ si kwuo, otu 'Peoples Democratic Party' họpụtara Mazị Patrick Ndubueze onye okpuruọchịchị Okigwe, ebe ndị 'All Progressives Grand Alliance' họpụtara Mazi Charles Onyirimba onye okpuruọchịchị Ehime Mbano.