Ị na-eru uju? Lee Etu ị ga-esi nyere onwe gị aka

Mgbe e biputara ya

Ndị Igbo na-atụ ilu sị na "ọnwụ bata nga ajụọ oyi". Ilu ọzọ na-ekwukwa na "onye cheta ọnwụ, o mee nwayọọ."

Ilu ndị a na-egosi na ọnwụ bụ nnukwu ihe iru uju nakwa ihe mgbu oge ọbụla ọ batara.

Ọtụtụ mgbe ka ọ na-ara ọtụtụ mmadụ ahụ ịpụta n'arịrị ma ọ bụrụ na onye ha hụrụ n'anya nwụnahụ ha.

Oge ụfọdụ, ndị dị otu a ga-erugide ụjụ ọ fọ ma ha were aka ha gbuo onwe ha.

BBC Igbo kpọtụụrụ oriaku Pamela Udoka bụ onye ọkachamara na ngalaba Bekee kpọrọ 'Psychology', ma sorokwa n'otu a kpọrọ 'Nigerian Association of Clinical Psychologists'.

Ọ kọwara na ọ dị ụzọ ihe atọ mmadụ na-agabiga ma onye ha hụrụ n'anya nwụọ.

Ụzọ ihe atọ a bụ:

  • Oke nkụja (shock)
  • Ekweghị ekwe (denial)
  • Nnabata (acceptance)

Oriaku Udoka kọwara na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-agbawa ndị hụrụ ya n'anya obi nke ukwu, ọ kachasị ọ bụrụ onye nwụrụ ọnwụ ike.

Ndị nke ya anaghị ekweta na ya bụ ihe emeela, maka na ọ na-agbagwoju ha anya.

O kwuru sị: "Ọ bụrụgodu onye rịara ọrịa tupu ọ nwụọ, oge ụfọdụ, ndị be ya anaghị achọ ịnabata na ọ laala mmụọ.

Ha ga na-asị na ọ ka mma na onye ahụ dị ndụ ma ya rịawa ọrịa."

Oge ụfọdụ ha na-ewe iwe, maọbụ na-ata ikikere eze, maọbụkwanụ na-ajụ Chineke ajụjụ ihe kpatara ya bụ ihe ji mee.

Ọ bụ oge a bụ oge Bekee kpọrọ "shock" nakwa "denial".

Mana ka oge na-aga, a malite ime emume akwamozu onye ahụ nwụrụ anwụ, ọ ga-edo ndị nke ya anya na ihe a na-ekwu bụkwa eziokwu.

Oge ahụ, ha ga-ejizi nwayọọ nabatawa ya bụ ihe.

Etu ị ga-esi pụta n'arịrị

BBC kpọtụkwaara ọkachamara ọzọ, bụ Ọkammụta Mitchelle Ori onye tinyere ọnụ n'okwu a.

Oriakụ Udoka na oriaku Ori kwuru na ihe onye mmadụ nwụnahụrụ ga-eme bụ ndị a:

  • Ịnabata na ya bụ ihe emeela, na ọnwụ bụ ihe ga-erutecha onye ọbụla, nakwa onweghị ihe mmadụ nwereike ime ka onye nwụrụ anwụ lọghachi."
  • I na-echeta ihe ọma na ihe aṅụrị onye ahụ nwụrụ anwụ mere oge ọ dị ndụ ma were ya kasie obi
  • Ịgba mbọ chefuo ihe niile gị na onye ahụ nwụrụ anwụ gaara emekọ ọnụ ma a sị na ọ dị ndụ
  • Zeere ịnọ naanị gị oge niile; chọọ ndị ọzọ hụrụ gị n'anya ka ha na-anọnyere gị
  • Maka ndị kwenyere na Chineke, ekpere ga-enyere gị aka.
  • Ịchọ ụzọ iji mee ihe ọ dị gị ka onye ahụ nwụrụ anwụ ọ gaara eme ma ọ bụrụ na ọ dị ndụ
  • Ọ bụrụ na ihe na-akawanye njọ, chọọ onye ga-enyere gị aka dịka ndị ndụmọdụ Bekee kpọrọ 'counsellors' maọbụ ndị 'psychologists'.

Onye mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi.