Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha ji kwuo maka ọkwa onyeisila Naịjirịa

Mgbe e biputara ya

Otu n'ime isiokwu pụtara n'ụtụtụ a bụ na Ohaneze ndị Igbo na ndị otu Indegenous People of Biafra (Ipob) ekwekọrịtala ịchụwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Mana nke a abụghị eziokwu ma ọlị.

Mgbe BBC Igbo kọtụrụ Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako ya na Onyeisi ndị Ohaneze ndị Igbo n'Anambra steeti bụ Damian Okeke-Ogene, ha abụọ kwuru otu olu na ya bụ okwu.

Ha sị na ọ bụ n'ezie na Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha jiri kpaa maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọgbakọ ha nwere izuụka gara aga.

Ha abụọ kwuru na ya bụ mkparịtaụka anyị nweere ha iche iche n'ekwentị, na Ohaneze na Ipob nwere nkwekọrịta nke ha, na isiokwu ha bụgodi ịkpe udo n'ime ha, ọbụghị ọkwa onyeisiala Naịjirịa.