You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu agbarụrụ ihu sị na Ohanaeze gbara mkparịtaụka ha nwere n'anwụ
Onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akatọọla akatọọla etu Ohanaeze ji gbaa mkparịtaụka ha nwere n'anwụ.
O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'akara Facebook ya n'ụbọchị Wenesde sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ wepụtara na Ipob garOhanaeze na-agba mbọ.
- Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya
- Naịjirịa, kụchaanụ Nnamdi Kanu aka - Ndị ntorobịa Ohaneze
Ọ sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ dere na Ipob rịọrọ Ohanaeze ka ha gwa gọọmentị ka e wepu aha ha na ndị na-eyi ndụ egwu.
Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ha na Ohanaeze na-enwe mkparịtaụka ugboro abụọ n'Anambra nakwa Enugwu kama na ọ bụghị maka ịrịọ ha arịrịọ n'ụdị ọbụla.
Ọ sị na ọ bụ naanị mkparịtaụka udo bụ ebe ha kwerịkọtara na a gaghị ewepụta ozi ọbụla banyere mkparịtaụka a.