Nnamdi Kanu agbarụrụ ihu sị na Ohanaeze gbara mkparịtaụka ha nwere n'anwụ

Mgbe e biputara ya

Onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akatọọla akatọọla etu Ohanaeze ji gbaa mkparịtaụka ha nwere n'anwụ.

O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'akara Facebook ya n'ụbọchị Wenesde sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ wepụtara na Ipob garOhanaeze na-agba mbọ.

  • Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya
  • Naịjirịa, kụchaanụ Nnamdi Kanu aka - Ndị ntorobịa Ohaneze

Ọ sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ dere na Ipob rịọrọ Ohanaeze ka ha gwa gọọmentị ka e wepu aha ha na ndị na-eyi ndụ egwu.

Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ha na Ohanaeze na-enwe mkparịtaụka ugboro abụọ n'Anambra nakwa Enugwu kama na ọ bụghị maka ịrịọ ha arịrịọ n'ụdị ọbụla.

Ọ sị na ọ bụ naanị mkparịtaụka udo bụ ebe ha kwerịkọtara na a gaghị ewepụta ozi ọbụla banyere mkparịtaụka a.