Ndị Ugwu na-achị Naịjirịa adaala, ka e nye ndị Igbo ọchịchị - Onye Fulani
Dịka okwu onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 na-arị elu ebe niile, Onyeisi otu kpọrọ onwe ya "South East for President" bụ Wan Mohammed Shehu agwara BBC ebumnuche ha banyere ọchịchị Naịjirịa.
Maazị Shehu si na "ndịisi n'Ugwu Naịjirịa achịtaghị Naịjirịa" nke mere o Ji si ka ha nyee ohere ka onye Ọwụwanyanwu were ọnọdụ.
Ọ sị na okwu ụfọdụ na-ekwu banyere ihe mere tupu alụọ agha abụghịzị ihe e kwesiri ị na-ekwu taa.
Ọ sị, "Agaghị ata nwata afụfụ maka ihe nna ya mere."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị ọnwa isii ka onye Igbo nọrọ n'ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa.
Mana ka Shehu na-ekwunyere ndị Owụwanyanwụ maka ịchị Naịjirịa, ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị na-agba mbọ ka e kee Naịjirịa bụ ndị Bekee na-akpọ "traitors".
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'ihe nkiri a.