Etu Naịjirịa siri mee ụwa 'ọnụ pịịm' dịka ha ritere ọlaedo na Olympic 1996

Mgbe e biputara ya

N'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgụst 1996, Naịjirịa mere ihe atụghị anya ka ha ritere ọlaedo na asọmpị bọọlụ ụmụnwoke na Olympic nke emere n'obodo Atlanta.

Nke a bụ mbụ mba si Afrịka kpara ụdịrị ike ahụ.

Lee akụkọ njem ha n'asọmpi ahụ dịka ha meriri ndị kachasị ogogo n'ịgba bọọlụ na mba ụwa.