Ipob in Enugu: Lee etu ha si akpọku ndị otu ọhụrụ

Aha onyonyo, Lee etu ndị Ipob n'Enugwu si akpọku ndị otu ọhụrụ
Mgbe e biputara ya

Ụfọdụ ndị na-akwado otu Indigenous People of Biafra (Ipob) mere ngagharị n'Enugwu steeti ịchọta ndị ga-esonye ha.

Ha kesara mpempe akwụkwọ ebe ha kọwara ebumnobi ha ka ndị mmadụ bịa sonye maka ọchịchọ Biafra, nakwa ndịiche dị n'etiti Naịjirịa na Biafra.

Mpempe akwụkwọ maka Biafra
Nkọwa foto, Ha kesara mpempe akwụkwọ maka ozi gbasara Biafra

E setere ha n'ihe onyonyo dịka ha na-agụ egwu na-ekwu na "Anyanwụ awaala".

Ọkaiwu Paul Achalla bụ onye Ipob ọnụ na-eru n'okwu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ngagharị a dabara adaba.

N'okwu ya, ọ sị "Ozi ọbụla mmadụ na-ezi na-asị ndị mmadụ bịa soro Ipob, ọ bụrụgodi ndị Naịjiria na-aga na-ekesa mpempe akwụkwọ, anyị kwere na ya".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: