Uche Nwosu ekwuputala ndụmọdụ o nyere Hope Uzodinma maka ọchịchị

Aha onyonyo, Uche Nwosu ekwuputala ndụmọdụ o nyere Hope Uzodinma maka ọchịchị
Mgbe e biputara ya

Uche Nwosu zọburu ọkwa gọvanọ n'Imo steeti n'okpuru pati Action Alliance, gwara BBC Igbo etu o si dụọ Hope Uzodinma bụ gọvanọ steeti ahụ ọdụ ka o tinye uchu n'ịrụ ọrụ ghara ịga chụgharịwa ndị ọ nọchiri n'oche.

Nwosu kwuru sị na ihe ndị Imo steeti ga-eji cheta Uzodinma bụ ọrụ ọ rụrụ, na ọ bụghị ndị ọ chụgharịrị maọbụ lụso ọgụ.

O kwukwara sị na ọ ga-adị mma ma Uzodinma nyere aka chịkọta pati ha ọnụ, ka a ghara inwe nkewa n'etiti ha.

Nwosu tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara mkpu ndị Igbo na-eti maka mbata ndị Fulani n'ala Igbo.

Ọ rụtụrụ aka na ndị Igbo na-azụ ala ma rụọ ụlọ na mpaghara Ugwu, mana kwuo na ndị Fulani na-abịakarị n'ala Igbo bụ ndị nke na-achị ehi, na e nweghi etu a ga-esi were ala gọọmentị resị ha.

Gere ihe o kwuru n'uju ebe a: