You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Police Brutality: Etu mgbọ egbe ndị uweojii si egbu anyị karịa coronavirus
Mgbe e biputara ya
Ndị bi n'obodo Mathare dị na Kenya etiela mkpu maka mkpagbu nd uweojii na-akpagbu ha n'oge coronavirus a.
Ha sị ndị uweojii dị na mbụ were aka ike na-eso ha n'obodo ahụ, mana nke oge coronavirus a akala njọọ.
Akụkọ sị na ndị uweojii gbagburu otu nwata nwoke dị afọ iri na atọ ebe ha na-achị ndị mmadụ ka ha ghara ịpụta ezi dịka gọọmentị nyere n'iwu.
Ọzọ pụtakwara sị na ndị e chere na ha bụ ndị uweojii kugburu otu nwoke.
Nke a mere ndị obodo a ji bido ngagharịiwe na-asị na ọ bụ ndị uweojii na-egbu ha na ọ bụghị coronavirus.
Kirie ya n'uju;
Akụkọ ndị ga-amasị gị: