Abacha loot: Nna m gaara azara ọnụ ya n'ebubo izu ego ma ọ bụrụ na ọ dị ndụ
Mgbe e biputara ya
Sadiq Abacha bụ nwa ọchịagha Sani Abacha chiburu Naịjirịa etinye ọnụ n'okwu banyere ọchịchị nna ya chịrị Naịjirịa.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọ sị na ndị nọ n'ọchịchị n'oge nna ya na-achị Naịjirịa maara na ọ bụghị ozuzu ka nna ya zuru ego ndị a, kama na ọ bụ maka iji mee ihe ndị ọzọ.
Ọ sị na ọ bụrụ na nna ya dị ndụ, na ọ gaara azara ọnụ ya banyere ebubo izu ego ndị Naịjirịa.
Sadiq gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa chọrọ ịma nke bụ eziokwu na ha mee nyocha.
O kwukwara na ọchịchị nna ya bụ ọchịchị zuru onye ọbụla ọnụ, nke bụ onye ukwu rie, onye nta rie.
Kirie ihe o kwuru n'uju;
Akụkọ ndị ga-amasị gị: