Coronavirus lockdown: 'O dị mma ka ụka nyere gọọmentị aka iji chụọ coronavirus ọsọ'

Mgbe e biputara ya

Onye bụbu Bishọp ụka Anglịkan na dayọsis Mbaise bụ B.J.E Ogu ekwuola na ọ dị mma ka ụka nyere gọọmentị aka iji chụọ ọrịa coronavirus ọsọ ụkwụ eru ala na Naịjirịa.

Bishop Ogu kwuru nke a na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC Igbo n'ụbọchị Tuzde.

O kwuru na ọ bụrụ na e mechie ụlọụka dị icheiche ihe dịka izuụka abụọ maọbụ atọ iji gbochie mgbasa ọrịa a, ọ ka mma.

Cheta na Bishọp ụka Anglịcan Enugwu bụ Emmanuel Chukwuma kwuru na ya akwadoghi imechi ụlọụka n'ihi coronavirus.

Bishop Chukwuma kwuru na ụlọụka bụ ebe ndị mmadụ si enweta ngọzị na amara.