Coronavirus: Ihe ga-agwọ coronavirus nwereike bụrụ nwa mpe mpe ihe - Mbaka
Mgbe e biputara ya
Ụkọchukwu na-elekọta ụlọ ekpere a kpọrọ Adoration Ministry dị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ihe ga agwọta ọrịa coronavirus nwereike bụrụ obere ihe.
O kwuru nke a dịka ọ na-akọwa na nje a gbara ndị ọkammụta n'ụwa dum gharịị.
O kpekwara ekpere ka Chukwu nye amamihe a ga-eji merie ya bụ nje.
Mbaka kwukwara na ọrụ dịrị ndị amụma dịka ya site n'ịgba mbọ n'ekpere maka nje coronavirus a.
Ọ sị ka ndi ụka ya malite ibu ọnụ ka ọrịa coronavirus bụrụ ihe gara aga.
Nke a na-abịa ka ndị bu ya bụ nje ruru mmadụ iri atọ n'ise na Naịjiria, nke gunyere mmadụ abụọ gbakere agbeke na otu onye nwụrụ.



