China Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka ọrịa a - Onye Naịjirịa nọ na China

Mgbe e biputara ya

Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha nọ ebe ahụ si kwụrụ.

Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha.

Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ.

"Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ 'Quarantine' ugbua.

"A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ ga bute nje ahụ."

Gee ihe o kwuru n'uju.