Father Mbaka: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru

Aha onyonyo, Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma
Mgbe e biputara ya

Ụkọchukwu na-elekọta 'Adọration Ministry' Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya nọ n'ụlọ ekpere ya na-erighi nri ọbụla ganye na Ụlọikpe Ukwu ekwuo na Hope Uzodimma emeriela dịka gọvanọ Imo Steeti.

Fada Mbaka onye guzobere ụka ịtụ mmamma maka mmezu amụma o buru ụbọchị 31 nke ọnwa Decemba 2019 kwuru na obi dị ya mma na Hope bụ onye ga-azọpụta ndị Imo steeti.

Ọ gwara ndị Imo ka ha nye Hope afọ abụọ nke ọ ga ejị dozigharịa obodo ahụ.

Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepụ aka ka ha si akọ ya ọnụ na Soshal midia n'ihi na amụma ya na ebụ bụ ọ natara chi ọbụghị nke a kpara akpa.

Okwuru na obi adịghị ya mma na ndị ụka katọliki sozi na akatọ ya kama ha ga na-eto ya maka ọrụ ebube chukwu na-arụ site n'aka ya.

Mbaka sị na ọdịda Emeka Ihedioha dara bụ maka ịkpọchị ntị ya n'amụma, wee kwuo na kama Ihedioha gaara ịbịakwute ya ka o busiri amuma ahụ, ọ gara kwuo na onweghị ihe oji ya kpọrọ.

Ọ gbarụrụ ihu kwuo na ndị niile na akpọ gani gani ka a chụpụ ya n'ụka katọliki agbajọọla ya n'ihi na onweghi ike ịmechi ọnụ ya ma amụma bata n'ime ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: