You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu
Mgbe e biputara ya
Gịnị ka ị merela maka ịhụnanya?
Sid Jammal bụ onye ọcha birila na Naịjiria ọtụtụ afọ ji maka ịhụnanya o nwere ebe nwunye ya nọ wuoro ya ụlọ dị ka ụgbọelu.
Jammal kọwara na n'ihi na ọ na-amasị nwunye ya ime njem ụgbọelu oge ọbụla, ya kpatara o ji mee ka ọ na-eteta ụra n'ịme 'ụgbọelu'.
Jammal bụ ome nka, wuru ụlọ a n'Abuja, kama ọ rụchabeghi ya makana kwa oge ka ọ na-arụnye ya ihe etu o si masị ya.
Akụkọ ga-amasị gị: