'Ọ bụ ndị Uweojii gbara ụlọ anyị ọkụ' - Ndị Aba

Mgbe e biputara ya

Ndị mmadụ bi n'ogbe akpọrọ Okojombo, Degema dị na Ndiegoro, Aba nke dị na Kansulu Aba South n'Abia steeti e boola ndị Uweojii ebubo na-ọbụ ha gbara ụlọ obibi nakwa ụlọ ahịa ha ọkụ.

Mgbe BBC Igbo rutere ebe ahụ iji hụ ka njinji ahụ siri jie, a hụtara etu ọkụ siri gbapịa ụlọ ruru asatọ n'ọnụọgụgụ, bụ ebe ndị mmadụ bi nakwa ebe ụfọdụ na-ere ahịa.

Dịka BBC Igbo siri hụta, ngwongwo ọnụ ego ya ruru ndekwuru nde naira bụ nke ọkụ tapiara, bụ nke gunyere ngwa ahịa dị iche iche, otu ụgbọala ụlọ nakwa ọtụtụ ngwongwo eji biri na ha.

Dịka ndị nke a metụtara siri gwa BBC Igbo, ihe butere ihe mberede a bụ etu ndị uweojii ji abiakari n'ogbe ahụ oge ọbụla ma na-anakọrọ ndị mmadụ nakwa ndị ọkwọ ụgbọala ego ha.

Ha gara n'ihu ma kọwaa na njinji a malitere n'ụbọchị Fraịde izu gara aga, oge ndị uweojii nakwa ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala bidoro inwe nghọtahie gbasara ego.

Akụkọ kọrọ na ndọrọndọrọ a butere ọnwụ otu onye uweojii, bụ nke butere oke ịkwarịta mgbọ n'ebe ahụ.

Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbapuru n'ebe ahụ maka ize ndụ, ọtụtụ merụrụ ahụ, ebe e bokwara ndị uweojii ebubo na ha gara n'ihu kụkawa ụlọ mmadụ ma bukorowa ngwongwo ha.

Ha kwuru na ihe a gakwara n'ihu na-eme site n'ụbọchị Fraịde ma rue Tuzde izu ụka a bu mgbe ha biara munye ọkụ n'ebe ahụ ma bukorochaa ihe ndị mmadụ nwere.

Oge ha na-agwa BBC Igbo okwu, ndị a ihe a metutara kwara ariri na kamgbe ihe mechara, ha ka nọ n'ụjọ dịka ndị uweojii ka na-agagharị, na-eyi ndị bi n'ogbe ahụ egwu, dịka ha kpochirila ọtụtụ mmadụ nakwa ụmụaka nụlọ mkpọrọ.

Ha gaziri n'ihu ma kpokuo Govano Okezie Ikpeazu na-achị steeti Abia ka ogbatara ha oso enye m aka na-ajo onodu a.

Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwaburu BBC Igbo na onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa.

Ọ aka na-achị steeti ahu bụ Okezie Ikpeazu ma maka n'okwu gbasara mwakpo akwakporo ndị mpaghara Ndiegoro ma na-etuntekwe anya na ya.

BBC Igbo gbakwara mgbọ ịnụta nke bu eziokwu n'ọnụ Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru uweojii n'Abịa steeti mana ọ zaaghị.