Rural Electrification: 'Enweghị ọkụ na-ata anyị ezigbote ahụhụ n'Awgu'

Aha onyonyo, Rural Electrification: 'Enweghị ọkụ na-ata anyị ezigbote ahụhụ n'Awgu'
Mgbe e biputara ya

Ọtụtụ ebe n'Awgu dị n'Enugwu steeti enweghi ọkụ.

Otu na-eke ọkụ latrik na mpaghara ahụ bụ EEDC kwuru na ọ bụ makana ha ji ụgwọ ọkụ.

Mana ndị Awgu sị na ọ bụghị nke ahụ bụ isi okwu.

Innocent Chukwueke na-ere azụ friji n' Olocha Awgu kowara BBC Igbo na ha zụrụ igwe ọkụ nke Bekee kpọrọ "transformer" n'aka ha na eriri ọkụ n'aka ha mana ha enwebeghị ọkụ kemgbe afọ 2015, bụ mgbe igwe ọku ha mebiri.

Ọ kwusikwara ike gwa ndị EEDC ha nye ha 'prepaid meter' na ha achọghị atụmatụ a kpọrọ 'Community Billing' na Bekee.

EEDC sara ha site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Emeka Eze sị na enweghị ọkụ n'Awgu esighi ha n'aka.

Maazị Eze sị; "Ọ bụ ọgwọ ndị Awgu ji anya bụ isi okwu"

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị ndị mmadụ ka ọ dịrị igo igwe ọkụ, dịka ọ bụ ọrụ ha.

Ka ọkwụ ugbua, ọkụ adịghị n'ọtụtụ ebe n'Awgu.

Lee ihe nkiri a ka ị mata nke na-eme n'uju:

Ndị mere akụkọ a bụ: Chiagozie Nwonwu na Chiemela Mgbeahuru

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị: