Imo state: Gọọmentị Ihedioha achọghị eziokwu, ihe ha chọrọ bụ imebo Okorocha

Aha onyonyo, Rochas na ama anyị aka n'ihu - Gọọmentị Imo
Mgbe e biputara ya

Dịka ndị mmadụ na-ajụ nke bụ isiokwu n'etiti Rochas Okorocha na onye nọchịrị anya ya n'ọchịchị Imo steeti, BBC Igbo emeela njem nchọpụta.

Jasper Ndubuaku, bụ onye ọtụtụ okwu na-erughari n'etiti ọrụ ya dịka onyeisi ngalaba na-achọta akụnaụba gọọmentị a na-eche na e zuru, gwara BBC Igbo etu okwu siri kwụrụ n'akụkụ ya.

Steve Osuji bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye Ihedioha n'ihe banyere mgbasa ozi, kwukwara etu o si metụta ha.

Sam Onwuemodo bụ ọnụ na-ekwuru Sinetọ Okorocha zarakwara ọnụ ha.

Ebe ndị nke Ihedioha na-ebo ebubo, ndị nke Okorocha na-agọ agọ, na-asị ha wete ihe mgbaama.

Ihe nkiri a ga-akọwa ihe a niile site n'ọnụ ha.