Anyị aṅụbeghi miri tọgbọ iko - Onyeisi ndị Nigeria na-azụ ahịa - Kizito Obiora

Aha onyonyo, Okwu Kizito Obiora maka nsogbu ndị Naịjirịa na-enwe n'ahịa Ghana
Mgbe e biputara ya

Dịka Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi "Nigerian Union of Traders Association" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - siri kọwaara BBC Igbo ihe na-ebe ka na-ebekwa na mpaghara Ashanti na mba ahụ.

Site na Fraịde bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Junn ruo ụbọchị Tusde nke izu a bụ izu atọ nke ọnwa Juun, ndị amaghị ndị ha bụ wakpochara ndị Naịjirịa ma manye ha ka ha gbachie ụlọahịa ha.