'Igbochi afọime megidere iwu Chukwu'

Mgbe e biputara ya

Taa bụ ụbọchị mbaụwa na-eme emume gbasara ụzọ dị icheiche e ji egbochi afọime oge mmadụ achọghị ya.

Ihe ndị a bụ ihe a na-akpọ 'World Contraception Day' na Bekee.

E ji ụbọchị taa agbasaozi gbasara mkpa ọ dị ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-enwe mmekọrịta anụ ahụ ịmata ụzọ dị mma iji gbochie afọime ghara inwe nsogbu ahụike.

Ụfọdụ ngalaba dị icheiche na okpukpe dị icheiche machiri igbochi afọime na ime ihe ga-akwụsị nwaanyị itu ime.

Ngalaba ụka Katọlik kwenyere ka di na nwunye mụta nwa oke ha ga-azụlị mana ha ga-agba mbọ hụ na ha egbochighi afọime ọbụla.

BBC Igbo gbara Fr, Edwin Obimma Ezike ajụjụ gbasara ihe ụa Katọlik kwuru maka igbochi afọime.

Fr. Ezike kwuru na ụka Katọlik akwadoghi ka nwaanyị kwụsị afọime ọbụla nwoke gbanyegoro ya n'ahụ.

O kwuru na nke a bụ maka na oge mkpụrụ nwoke banyere nwaanyị n'ahụ, mkpụrụ ahụ na akwa nwaanyị bịakọọ ọnụ, ndụ amalitela nke bụ na ihe ọbụla e mere ịkwụsị ndụ ahụ bụ imemina mmadụ.

Lee ihe Fr. Ezike kwuru ebe a.