Anambra floods: Ndị bi n'Odekpe n'Anambra steeti enweghizi ebe obibi
Ndị bi n'okpuruọchịchị Ogbaru dị n'Anambra steeti ka na-ebe akwa maka etu idemmiri si emenyu ha anya na be ha.
Ụfọdụ pụtara na twitter na-etimkpu ka gọọmenti mara ihe emere ya bụ ọdachị tupu o gbuchasia ha.
Mgbe afọ 2019 bidochara, ngalaba gbata gbata Naịjirịa bụ "Nigeria Emergency Management Agency" kwuru na ide mmiri nke afọ a ga-abụ kpọcha kpọcha.
Lee ụfọdụ ihe ndị si ebe ahụ na-ekwu na Twitter
@EarthenwareJ kwuru na o si ebe ahụ ma na-arịọ ka gọọmenti gbata ọsọ enyemaka.
@okeugochris kwuru na ya bụ ihe abụghị ihe ọhụrụ ma na-ekwu na onweghị ihe gọọmenti ga-emeli maka ya.
@_chukwunonso_ kwuru na ọ chọrọ ka gọọmenti steeti ahụ gosi nwute ma nyere ndị bi ebe ahụ aka.
Ihe gọọmenti Anambra steeti na-eme maka ya
Kọmịshọna na-ahụ maka mgbazaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na gọvanọ Willie Obiano gara Ogbaru na mbido afọ a wee rịọ ndị Ogbaru ha ga n'ụlọ nchekwa ewepụtara ha na mkpumkpu ala ma mmiri ozizo bidocha, ebe idemmiri agaghị ezute ha.
Don kwuru na gọvanọ Obiano gwara ha ha nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ọnwa Sepụtemba ga-agwụcha, ka idemmiri kwụsị tupụ ha alaghachị be ha.
Mgbe anyị jụrụ ya maka ebe ụlọ nchekwa ndị a dị , o kwuru na ọ dịka aja. Anyị wee gwa ya si ya ya akpọpụta ebe ndị ha dịgasị.
Ọ kpọpụtara Ihiala, Ozubulu, na Onitsha were na-ekwu na onyeisioche okpuruọchịchị Ogbaru bụ Arinze Awogu ga-akpọpụtara anyị ha niile.
Anyị na-akpọ Arinze n'ekwenti mana ọ zabeghị, anyị ka ga na-anwa ịnweta ya.
Ihe mere ebe ahụ na 2018
Ụlọakwụkwọ niile nọ n'obodo atani buzị nke kpọchiri akpọchi n'ihi na mmiri etochiela ụlọakwụkwọ ha.
Mmiri ahụ sitere n'oke osimiri Niger ekwobata, malitere ihe dịka izu uka abụọ gara aga oge o bidoro towe n'ike n'ike.
Ọtụtụ mmadụ gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na gọọmentị dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbapụ ọsọ na ya bụ idemmiri na-abịa, mana ha kwuru na ha enweghị ebe ha ga-agbaga.
Kamgbe mmịrị ahụ kwobatara n'obodo Odekpe n'Atanị, ndị o riri ụlọ ha eburula ngwongwo ha gbaga na Central school Odekpe, ebe gọọmentị sị ha nọrọgodi.
Ndị obodo gbatara ọsọ ndụ na Central school Odoekpe, ọkachasị ụmụnwaanyị na ụmụaka, sị na agụụ egbuola ha n'ihi na onweghi onye na enye ha nri.

Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Ha kwara arịrị na onweghị ihe ha wepụtara n'ụlọ ha tupu mmiri eburu ngwongwo ha.
Chinyere Nwakonwu, Ugochukwu na Catherine Ndubuisi kwara arịrị na akwa ha ji arahụ ụra, TV, fridge, oche, ego na nri oriri bụ nke mmiri a burugoro n'ụlọ ha.
Ọtụtụ ụlọ n'Atanị bụkwa nke mmiri bubara n'oke osimiri Niger.

Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Ụlọụka juru n'obodo abụọ ahụ ọkachasị Atanị na Ọdekpe, bụ nke mmiri tochiri mere na ndị ụka anaghịzị abịa ụka, ndị ụkọchukwu gbakwara ọsọ ndụ.
Na St Joseph catholic Church Atani, Kings ambassadors seminary Atani, ụlọụka central school Odekpe kpọchiziri akpọchi n'ihi na mmiri etochiela ya.
Ụmụakwụkwọ Oko polytechnic Atanị Campus akwarala ngwongwo ha laa be nne na nna ha, n'ihi na onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Rev Fr. Ogene nyere ha ezumike ngwangwa otu izuụka iji mara ma mmiri ahụ ọ ga-alaghachị ebe o siri kwota.

Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Ụmụakwụkwọ abụọ na-agụ akwụkwọ na ya bụ polytechnic bụ Chibuike na Obed kwuru na obi adịghị ha mma n'ihi na ezumike erughị eru mmiri ahụ butere, ga-emetụta ha n'ule ha kwesịrị ime.
Ndị Ọdekpe na Atani a dị n'Okpuru ọchịchị Ọdekpe, na-akpọ idemmiri "iju" n'olu ndị be ha.
Akụkọ ga-amasị gị