Ogbambọ: Etu anyị siri jiri ihe onyoonyo atụgharị ihe e jiri mara Anambra steeti
Michael Chineme Ike na Benneth Nwakwo fooro ntutu ha taa na ha ga-akpọbatarịrị ọrụ ịmepụta ihe onyoonyo n'Anambra steeti.
Ụmụntorobịa abụọ a ji ego ha na ihe ndị ọzọ ha nwere akwado atụmatụ a kemgbe afọ atọ a gara aga.
Ha sị na-agbanyeghị na ha enwetebeghị nkwado ọbụla n'aka gọọmentị, na "ụmụntorobịa ndị Anambra na-anabata ihe anyị na-eme".
Ha kwukwara na ha emepụtala ihe onyoonyo ole ma ole mana ha erubeghị ebe ha chọrọ iru nke bụ ịbụ ndị ọkaibe n'ọrụ ihe onyonyo n'Anambra steeti.
Ha kwukwara na ihe kacha echere ha aka mgbe, ewezụga ego bụ agwa ndị a ma ama na Nollywood na-akpasa ha.
Michael kwuru na a na-eleghara anya maka na ha bụ ụmụakwụkwọ, ma kwuo na ha anaghị enweta ụdịrị ego ndị a ma ama na ya bụ ọrụ na-enwete.
Nke a mere na ha na-arịọ ha biko mgbe niile.
Nke kacha enye ha nsogbu bụ na ụfọdụ ndị a ma ama mere ebere sonye ha n'ọrụ anaghị ekwe enyere ha aka agbasaozi maka ihe ngosi ha na-eme.
Ha sị na ebumnobi ha bụ ịbute Nollywood n'Anambra steeti mgbe adịghị anya.
Ha nwere olileanya na nke a ga-abịa na mmezụ mgbe adịghị anya.