Vicky Eboh Songs: "Egwu m na-agụ bụ iji jaa ụmụnwaanyị ike"

Aha onyonyo, Vicky Eboh Songs: "Egwu m na-agụ bụ iji jaa ụmụnwaanyị ike"
Mgbe e biputara ya

O doro ewu na ọkụkọ anya na ndị nne dị ezigbo mkpa n’obodo nakwa mbaụwa, nke a mere nwaada Victoria Eboh ji na-etiri ụmụnwaanyị egwu pụrụiche.

Eboh bụ oti egwu a ma ama sị na ọ na-eme nke a iji jalite mmụọ ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị Nne maka ọrụ ọma ha na-arụ n'ezinaụlọ.

A na-akwanyere ha ugwu pụrụiche maka ọrụ ndị gụnyere ịmụ ụmụ, ịzụ ụmụaka, inyere ndị di ha aka, idozi na idokwa ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ nke ha na-arụ n'ime ezinụlọ.

Eboh kwuru na mmasị ya ịgụ egwu malitere mgbe ọ dị na nwata ma mgbe ọ bụ aghọghọ.

Ụjọ mmasị ya n’egwu mere nna ya jiri chọọ ịkwụsị atụmatụ ya ịgụ egwu dịka o kwuru na nna ya tụrụ egwu na mmasị ahụ nwereike ime ka ọ hapụ ịguru akwụkwọ ya n’isi.

Nwaada Eboh kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa nke Nsukka ma gakwaa ofesị gụruo ya bụ akwụkwọ n’isi.

Eboh kọwaara BBC Igbo ihe mere o jiri nwee mmasị ugbua ịgụrụ ndị nne egwu bụ etu obi dị ya ebe nne ya nọ, dịka o kwuru na ọ zụrụ ha nke ọma ma taa ahụhụ.

O kwuru na atụmatụ ịgụrụ ndị nne egwu a nwereike ikpalite mmụọ ndị mmadụ ka ha cheta nne ha ma leta ha anya.

Eboh kwukwara na nne di ya na-elete ya anya nke ọma, ya bụ na egwu ya abụghị naanị maka nne ya, mana ọ bụ egwu nye ndị nne ọma naanị nọ n’ụwa.

O nyere ndụmọdụ na ọ bụghị naanị ndị mụrụ nwa bụ nne, o kwuru na onye ọbụla a kpọrọ nne mee ihe e ji kpọọ ya nne ma mmeruo ya n’isi.