You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Ihe mụ na Nnamdi Kanu kpara mgbe m gara hụ ya - Aloy Ejimakor
Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanụ bụ onye gọọmentị Naijirịa na-ebo ebubo dị iche iche ekwuola ihe ya na Nnamdi Kanu kpara mgbe ọ hụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asaa ọnwa Jenuwarị a.
Cheta na gọọmentị Naijirịa na-ebo Nnamdi Kanu ebubo dị iche iche nke gụnyere ịkpalịta ndị mmadụ imebi ihe gọọmentị ,ịwakpo ndị uweojii, wdgz.
Nnamdi Kanu bụ onye ama ama dịka onyeisi otu Indigenous People Of Biafra nke bụ otu gọọmentị Naijirịa amachịrị amachị nọ n'aka gọọmentị ebe anwụchịrị ya.
Ejimakor kwuru maka mpụtara ikpe e kpere Nnamdi Kanu n'Ụmụahịa, Abia Steeti na etu ọ ga-esi metụta ikpe nke a na-ekpe n'Abuja.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ karịrị otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.
Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.
A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.
Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.
O kwenyere n'ofufe Judaism.