E ji ụtarị pịagbuo nwa m maka ebubo ịṅụ mkpụrụ mmiri

Aha onyonyo, mkpụrụ mmiri
Mgbe e biputara ya

Nne na nna nwa okoroọbịa e ji ụtarị pịagbuo maka ebubo ịṅụ mkpụrụ mmiri akọọrọla BBC Igbo etu e siri gbuo nwa ha.

E boro ya ebubo na ọ na-aṅụ ọgwụike mkpụru mmiri nke bekee na-akpọ Methamphetamine eji kwa Crystal Meth mara.

Ndị Ezinụlọ ya bụ nwa okoroọbịa na-ekwu na nwa ha nwoke anaghị aṅụ cịga ma ya fọzịa mkpụrụ miri.

Gịnị bụ mkpụrụ mmiri?

Mkpụrụ Mmiri bụ ọgwụike gọọmentị machiri nke a na-akpọ Methamphetamine n'okwu bekee maọbụ Crystal Meth.

Ya bụ ọgwụ na-emetọ ọtụtụ ndị ntoroọbịa n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa.

Ọtụtụ ndị obodo ji aka ha aluso mkpamkpa ya bụ ọgwụike ọgụ.

Kedụ ndị paịgburu nwa okorọbịa a?

Dịka o si dị n'ala Igbo, Ọ bụ ndị ntọrọobịa na-ahụ maka nchekwa na ịhụ na ndị ntoroọbịa ibe ha rubereisi n'ịwụ Obodo.

Ọ bụ ndị otu ntoroọbịa jidere ya bụ nwa okoroọbịa were taa ya ahụhụ maka ebubo na ọ na-aṅụ mkpụrụ mmiri.

Kedụ ihe ndị nchekwa na-ekwu?

Ndị nchekwa na-aluso ọgwụike ọgụ bụ Nigerian Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) na-ekwu na oteela aka ya bụ ọgwụike nọ n'ala Naijirịa.

Ndị ọrụ NDLEA

Ha kọwara na ọ bụ ndị si mba Meziko, Ekụadọ na Brazil bụ ndị bidoro ya na Naijirịa.

Ha mechara nyefee ya n'aka ndị Naijirịa.

Ndị uweojii kwuru na ya bụ ọgwụ na-enye obodo nsogbu maka ndị omekome na-aṅụ ya.

Maka ọnwụ nwa ntoroọbịa a, ndị uweojii si na ha na-eme nyocha ha.