You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
"Ọ dịghị mma nwoke ịgwa nwunye ya ego ole ọ na-enwete" - Blessing CEO
Di na nwunye kwesiri ịbụ otu maka na ha bụ otu n'ime mmụọ ma n'eziokwu.
Ha abụọ kwesịrị ịbụ ji na mmanụ, obi na ara dịka omenala na ụka siri kwekọrịta.
Mana agbanyeghị ka ụtọ di na etiti nwaanyị na dị ya, ọ nwere ihe abụọ nwoke anwaghị anwa gwa nwaanyị ya.
Olee ihe nwoke enweghi ike ịgwa nwunye ya agbanyeghị ịhụnanya o nwere ebe ọ nọ?
•Nwoke agaghị agwa nwunye ya onye ọ dịnara?
Ọtụtụ umunwoke enweghịike ịgwa nwunye ha onye ọ na-edina maka na ha che na ọ pụrụ ịgbawa nwonye ha obi.
Ụfọdụ ụmụnwoke chekwa na ịgwa nwunye ha onye ọ na-ara bụ ibute ọgbaaghara n'ezinụlọ ha.
N'ihi nke a, nwoke agaghị achọ iji aka ya kotere onwe ya nsogbu sịte na-ikwu udiri okwu ahụ.
Nke bụ eziokwu bụ na ụmụnwoke ndị ọzọ gana ele nwoke kwuru ụdị ihe ahụ anya ka "onye nko" (onyeamaghị ihe).
Charles Mbamara bụ onye degoro akwụkwọ maka ọdịmma nwoke na nwaanyị sị na ịgwa nwaanyị ụdị okwu ahụ bụ sị ya "kwara lii:" (laa be ha).
Ọ sị, "nwaanyị ga na-asị gị, gwa m eziokwu, gwa eziokwu, ebe ọ na-ekpe ekpere ka ị ghara ịgwa ya. Mana ị mechaa gwa ya ihe ahụ mara na "nke gị ekpome" (nke gị agwụla).
Mana otu nwaanyị bụ onye ọkachamara na mmekọrịta nwoke na nwanyi bụ Blessing Okoro sị na o nweghị ihe ọ mere nwoke ịgwa nwunye ya onye ọ rara.
O kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị anabatala ịgba na-ezi ụmụnwoke na mpaghara a nke bụ na ha anaghịzị ahụ ya ka ihe ọhụrụ maọbụ ajọ ihe.
Ọ sị na nne na nna nwaanyị ahụ agaghị anabata ya n'ụlọ ha ma ọbụrụ na ọ lara maka na di ya gbara n'ezi.
Ọ sị na "ha ga-eji okpiri chụchie ya azụ".
•Ego ole nwoke na-enweta?
Nwoke bụkwa ọkaibe na mmekọ nwoke na nwaanyị bụ Charles Mbamara, onye a na-etu Charles De La Romeo sị na ya so na ụmụnwoke na-ekweteghị na ọ dị mma ịgwa nwunye ha ego ole o na-enweta.
O kwuru na nke a nwereike ibute mkparị n'aka nwaanyị ahụ maọbụ budaa ugwu ya.
Mbamara sị "nwunye gị ga-aka kwanyere gị ugwu ma ọ maghị ego ole ị na-enweta.
Ọ sị na ọ ga-aka njọ ma ọ bụrụ na ha mechaa see okwu.
Blessing Okoro kwenyakwara na ọ dịghị mma ịgwa nwaanyị ego ole ọ na-enweta agbanyeghị ka o si hụọ ya n'anya.
Blessing sị na nke a ga-eme nwaanyị ọ na-ana dị ya oke ego.
Ọ sị na " ọtụtụ ụmụnwaanyị agaghị ezuike rụọ mgbe ọ hụrụ isi ego ọbụla di ya nwere".
Otu nwoke achọghị ka akpọọ aha ya na-ekwu na "mgbe mụ na nwunye kacha adị na mma bụ mgbe ọ hụrụ na ego agwụla n'akpa m".
Ọ sị na nwunye ya agaghị akwụsị ịweta nsogbu ruo mgbe ọ hụrụ na ego ya agwụla kpam kpam.
Nwoke ahụ sịkwa na "mmehie m mere kacha ewute m bụ ịgosi nwunye m ego ole a na-akwụ m".
•Nwoke aga-agwa nwunye na ọ mụrụ nwa n'ezi?
Charles Mbamara sị na nke ahụ bụ nwoke iji aka ya gbaara onwe ya ụgbọ nwamkpi.
Ụmụnwoke ndị ọzọ sị na ụdị ihe a bụ ihe nwoke na na-agwa ụmụnna ka ha jiri ọnụ ha kwuo ya.
Blessing sị na o nweghị ihe ọmere na nwoke mụrụ nwa n'ezi maka na ụfọdụ ụmụnwaanyị gana ahụ dị ha ka onye eziokwu maka nke a.
•Nwoke aga agwa nwaanyi ka ọ ha n'ibu maọbụ ka ọ dị?
Blessing sị na ọ dịghị mma nwoke ịgwa nwaanyị ya na o buru ibu maọbụ na ọ jọrọ njọ maka ụdị okwu ahụ nwereike ịgbu mmụọ ya.
Mana Mbamara sị na ọnweghị ihe ọ mere mana ọ dabeere ka onye ahụ si kwuo ya.
Ọ sị, "nwoke dị otu a kwesiri iji olu ọma gwa ya nwunye ya.
Onye dere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke