DNA Test: Zizi Cardow sị na ọ bụ ụmụnwaanyị na-ebute nsogbu 'Paternity fraud'
Mgbe e biputara ya
Onye na-emepụta uwe ejiji ama ama bụ Zizi Cardow akọwaala ihe mere ọtụtụ ụmụnwaanyị lụrụla di ji apụ n'ezi tụrụ ime bubata n'ụlọ di ha.
Cardow mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka sị na ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị enyocha ụdị nwoke ha chọrọ tupu ha alụọ ya.
Ụdị nyocha ọ kpọrọ aha gụnyere, ahụike ma ọ ga-atụnyenwu nwaanyị ime, ntọala ezinaụlọ nwoke ahụ na ndịọzọ.
Cardow gara n'ihu kwuo na ụdị ọkụ a na-acha ụfọdụ ụmụnwaanyị n'ezinaụlọ na-eme ka anya ha dị n'ezi.
Kirie ihe Cardow kwuru n'uju.